IGBA

IGBA IGBA is a place of IGBO poetry, stories, folklores and other things relating to the igbo society.

ỌTỤRỤKPỌKPỌOtụtụ bụ ihe ekwuru n’ ọnu ma emeghị ya emekpatara ufọdu ji zabazie Omemgbeoji,Omemgbeoji gwara ụmụnna ya si ...
18/01/2025

ỌTỤRỤKPỌKPỌ

Otụtụ bụ ihe ekwuru n’ ọnu ma emeghị ya eme
kpatara ufọdu ji zabazie Omemgbeoji,
Omemgbeoji gwara ụmụnna ya si n’ọbụ nkwa ka o kwere na-ogbughị mmadu, naanị oge ka o ga-eri.
Onye na- egbughi ehi mgbe nna ya nwụrụ, ọ ga-eji ehi gaara enyi ya mgbalụ ?
Onye na- erughi otu mbe,a na-ebe ya mbe abụọ ?
Omemgbeoji e kwuola si, ka chi na- efo, na- eji.
O kwu iri, eme otu !!!.
Ọtụrụkpọkpọ si n' ụbọchị nne ya ga-anwụ ọnwụ, ọ nwere ọnụ gbagbusịa ọjị, o wee ruo ụbọchị nne Ọtụrụkpọkpọ nwụrụ, otuto nwee too Ọtụrụkpọkpọ n’ ọnụ. Ọtụrụkpọkpọ agbagbuziri ọji kwanụ ?
Nwanza rijuru afọ tụọrọ chi ya ọgụ, kedụ ihe kara ya obi ?
Azụ pụtara n'elu anị , ọ makwa ihe ọ na-eme ?.
Aka niile araghọ, kwelu ka ị ra,
Nwanne, akonuche bu isi ije,
Ọ kwa nga nga ka eji agbara ehi oso,
Onye aghuna nkwu ga-egbuya egbuoo,
Kwuo nke i ga-emenwu maka ị kwunye onwe gị n’ ọkụ, gị na ya emewe, ịkpachaghị anya, ọ ghụọ gị ka ji.
Gbakọọ ma tulee,
Anya saa gị n’ ije ụwa a,
O ji nwayọ anaghị emelụ ahụ,
Onye kwelụ nkwa na onye riri amụ ebune,
ha abụọ jicha ụgwọ,
N’ olu Chief Oliver d’ Coque, oti egwu, bụrụ "a simple man by nature”
Lotakwa,
Ọtụrụkpọkpọ si n' ụbọchị nne ya ga-anwụ ọnwụ, ọ nwere ọnụ gbagbusịa ọjị, o wee ruo ụbọchị nne Ọtụrụkpọkpọ nwụrụ, otuto nwee too Ọtụrụkpọkpọ n’ ọnụ. Ọtụrụkpọkpọ agbagbuziri ọji kwanụ ?
Ọgwusiwo
Ka m bia.
© Anyabolu Ifeanyi Dominion ( )
P.S: The image attached to this post is of the Woodpecker. In Igbo language, it is called Oturukpokpoo which is the title of the poem.
In Igbo folklore and parable, the Woodpecker stated in a boastful way that the day the mother will die , he will cut down a tree with it's beak.
Unfortunately, the day the mother died, a boil grew on its beak , so Oturukpokpoo was not able to do as he said 😁.

Ị BỤRỤ NKE M Ọ GỊNỊ FỌDỤZỊ ? E lechaa na mụ anya ma chee ya echee, A tulee la m ya ma nyochaa ya dịka onyokomita, Ọ digh...
12/06/2023

Ị BỤRỤ NKE M Ọ GỊNỊ FỌDỤZỊ ?

E lechaa na mụ anya ma chee ya echee,
A tulee la m ya ma nyochaa ya dịka onyokomita,
Ọ dighị kwa ihe mgbakwoju anya m hụrụ.
Naanị ihe na-adị m mma ka m hụrụ.

Ọ nwere ihe mmadụ ga-ahụ o rie ya ọnụ,
Ahụ ihe karịrị nte sị ree ọba,
Na Dịbịa gbara afa ugboro abụọ abụghị na Dibịa amaghị afa agba k**a ihe ọ hụrụ dị n'ụdị ọzọ,
Apụnanwụ, a hụrụ m gị gbakaa kpebie nọ n'ebe a ka mụ ga-ebi nje m.

Neenụ nwa amụrụ ya na mma,
Ọmaụmaasahụ,
Eleweukwuegbuewu,
Ọmalicha,
Anyanwụtụtụ !!!

Utọnwa, biko nwere nwayọọ na-aga ka m na- agba gị nkiri maka n' i medaala obi m,
Naanị anya m hụrụ mere m o nweghizi ihe na-aghọta,
Chaịị , Ọ ka ije lọọvụ a sị adị ?
Ewww chi m.

Ụtọnwa, kpụdebe mụ nso ka m gwa gị ka o si di m n' obi,
A maghị m ka o si mee, mana o doro mụ anya nọọ n' ebe ịnọ ka m ga-awụsa ọwa m,
Nne,bụrụ Ugegbe m ,a ga m abụkwa Ọdinobi gi,
Tulee obi m ka ị hụ na- e nwere m ezi ebumnobi ebe ị nọ,
A bịaghị m ka m jiri aghụghọ nara ngọzị.

Ọmaụmasaahụ,
Eleweukwuegbuewu,
A hụrụ m gị wee ree ọba,
Lee nu mụ anya ịhụnanya ka anyi wee bụrụ otu kporibe ụwa,
Ụwa na-atọ ụtọ ma adị abụọ na eme ya.
Nne,n'ezie ị bụrụ nke m, ọ gịnị fodụrụ ?

© Anyabolu Ifeanyichukwu Dominion


Address

Onitsha
430264

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when IGBA posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Share

Category